Isaiah 41

Onye na-enyere Izrel aka

1Nọrọnụ jụụ nʼihu m, unu mba niile mmiri gbara gburugburu!
Ka mba niile gbanwee ike ha.
Ka ha pụta kwuo okwu.
Ka anyị zukọtaa nʼebe ikpe ikpe.

2“Onye kpọtere onye a sitere nʼọwụwa anyanwụ na-abịa,
onye e sitere nʼezi omume kpọọ ya ije ozi?
O weere mba niile nyefee ya nʼaka,
meriekwa ndị eze nʼihu ya.
O ji mma agha ya tie ha mee ka ha ghọọ uzuzu,
jiri ụta ya mee ka ha ghọọkwa igbugbo ọka nke ifufe na-ebugharị.
3Ọ na-achụ ha ọsọ, ma na-agakwa nʼihu na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla.
E, ọ na-agbasokwa ụzọ nke ọ na-agabeghị mbụ.
4Ọ bụ onye rụrụ ọrụ dị otu a mezukwa ya,
na-akpọ ọgbọ niile site na mmalite?
Ọ bụ mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, onye dị siterị na mbido ihe niile,
onye ga-adịgidekwa ruo ọgwụgwụ ihe niile. Ọ bụ mụ onwe m bụ onye ahụ.”

5Mba niile bi nʼala mmiri gbara gburugburu ahụla ọrụ m rụrụ. Ha hụrụ ya tụọ egwu;
ndị niile bi na nsọtụ ụwa na-amakwa jijiji.
Ha zukọtara bịa nso.
6Onye ọbụla nʼime ha na-agba ibe ya ume na-asị,
“Nwee obi ike.”
7Onye ọkpụ ụzụ ọla na-agba onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ume.
Onye ji mkpirisi igwe eme ka ihe dị mụrụmụrụ,
na-agba onye na-akụ osiama ume.
Otu onye na-ekwu banyere nkpukọta ya, na-asị, “A kpụziri ya akpụzi.”
Onye nke ọzọ, na-eji ǹtu kpọgidesie ihe ahụ apịrị apị ike ka ọ ghara ịda.

8“Ma gị onwe gị, Izrel, ohu m,
Jekọb, onye m họpụtara,
gị mkpụrụ Ebraham, bụ enyi m.
9Esitere m na nsọtụ niile nke ụwa kpọghachi unu,
gwa unu na ohu m ka unu bụ,
nʼihi na ahọpụtala m unu,
agakwaghị m ahapụ unu.
10Ya mere, unu atụla egwu nʼihi na anọnyeere m unu.
Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nʼihi na abụ m Chineke unu.
Aga m eme ka unu dịrị ike; aga m enyere unu aka;
aga m ejikwa aka nri nke ezi omume m kwagide unu.

11“Lee! A ga-etinye ndị niile iwe ha dị ọkụ megide unu nʼọnọdụ ihe ihere,
ihere ga-emekwa ha.
Ndị niile na-eguzogide unu ga-aghọ ihe efu,
bụrụ ndị lara nʼiyi.
12Unu ga-ele anya ha, chọọ ha,
ma ọ dịghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ.
Ndị a na-ebuso unu agha
ga-abụ naanị ihe efu.
13Nʼihi na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị Chineke gị,
onye na-ejidesi aka nri gị ike
bụ onye na-asị gị, ‘Atụla egwu;
aga m enyere gị aka.’
14Atụla egwu, gị idide, bụ Jekọb,
unu Izrel dị nta, atụla egwu,
nʼihi na mụ onwe m ga-enyere gị aka,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,
Onye mgbapụta gị, bụ Onye nsọ nke Izrel.
15“Lee, aga m eme ka unu ghọọ igwe ọhụrụ eji azọcha mkpụrụ ọka
nke dị nkọ, nwekwa ọtụtụ eze.
Unu ga-azọcha ugwu niile zọpịa ha,
meekwa ka ugwu nta niile dịka igbugbo ọka.
16Unu ga-ayọgharị, fụchaa ha; ikuku ga-eburu ha bufuo,
oke ikuku ga-ekposasị ha.
Ma unu ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị,
nyaakwa isi nʼime Onye dị nsọ nke Izrel.

17“Mgbe mmiri ọṅụṅụ kọrọ ndị ogbenye na ndị mkpa na-akpa,
mgbe ha na-enweghị ike ịchọta mmiri ọṅụṅụ
mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ nʼihi agụụ mmiri,
mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-aza ha.
Mụ onwe m, bụ Chineke nke Izrel, agaghị agbakụta ha azụ.
18Aga m eme ka mmiri site nʼala kpọrọ nkụ nke ugwu niile na-erudatara ha.
Aga m eme ka isi iyi na-asọpụta na ndagwurugwu niile.
Aga m eme ka mmiri jupụta nʼọzara,
meekwa ka isi iyi mmiri site nʼala kpọrọ nkụ na-asọpụta.
19Aga m akụ nʼọzara,
osisi sida, na osisi akashia, na osisi mietul, na osisi oliv.
M ga-eji osisi junipa,
na osisi saipres na osisi fịa, kụkọta ha ọnụ nʼala ahụ tọgbọrọ nʼefu,
20ka ndị mmadụ hụ, matakwa,
tuleekwa uche ma ghọta,
na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a,
na ọ bụ Onye nsọ nke Izrel kere ya.

21“Wepụtanụ mkpesa unu,”
ka Onyenwe anyị sịrị,
“Doo okwu unu nʼusoro,”
ka Eze nke Jekọb na-asịkwa.
22“Ka ha bubata arụsị ndị a, ma gwa anyị,
ihe gaje ime.
Ka ha gwa anyị ihe mere nʼoge gara aga, ihe ha pụtara,
ka anyị nwee ike tulee ha
matakwa ihe ga-abụ ikpeazụ ha.
Maọbụ kwupụtara anyị ihe ndị ahụ na-abịa,
23gwa anyị ihe ọdịnihu ji,
ka anyị mara na unu bụ chi.
Meenụ ezi ihe, maọbụ ihe ọjọọ,
nke ga-eme ka anya gbagwojuo anyị, ka anyị jupụtakwa nʼegwu.
24Ma unu dị nta karịa ihe efu.
Ọrụ unu niile bụkwa ihe na-abaghị uru.
Onye họọrọ unu emeela onwe ya ihe arụ.

25“Akpọliela m otu onye site nʼakụkụ ugwu, ọ na-abịakwa.
Otu onye na-asọpụrụ aha m sikwa nʼọwụwa anyanwụ.
Ọ na-azọpịa ndị ọchịchị niile dịka ha bụ ụrọ,
ọ ga-azọpịa ha dịka onye na-akpụ ite si azọpịa aja ụrọ.
26O kwuru maka nke a site na mmalite, ka anyị nwee ike mara,
maọbụ mgbe na o mebeghị, ka anyị nwee ike sị, ‘Ihe o kwuru ziri ezi’?
O nweghị onye kwuru ihe banyere nke a,
o nweghịkwa onye mere ka amata ya,
o nwekwaghị onye si nʼọnụ gị nụ okwu ọbụla.
27Abụ m onye mbụ gwara Zayọn, ‘Lee, nʼebe a ka ha dị!’
Ọ bụ m ziteere Jerusalem onyeozi oziọma.
28Elegharịrị m anya ma o nweghị onye m hụrụ.
O nweghị onye nọ nʼetiti chi ha nke nwere ike inye ndụmọdụ;
o nweghị onye inye ọsịsa ajụjụ mgbe m jụrụ ha.
29Lee, ha niile bụ ụgha!
Ọrụ ha niile pụtara ihe efu,
arụsị ha niile awuru awu bụ naanị ifufe na ọgbaaghara.
Copyright information for IboBIU